33.5 C
Lagos
Tuesday, February 24, 2026

[Igbo Corner] Okwu ntabire ~ sitere na ọnụ Iwuoha Prince

Share this:

Dịka aha ya si dị, okwu ntabi ire bụ okwu nyiri ibe ha ana ekwu ngwa ngwa

Ọ dịghị nfe okwu kwụ. Ona enye onye na ekwu ya na onye na ege ntị anuri

Ọbụ otu na ụzọ Igbo si eme onwe ha obi uto

Genu ntị na okwu a

Ọkụkọ okwa akwa yiri ákwà na elu akwa ọ kwara akwa di n’elu àkwá.

Ka m kowa okwu ntabi ire a, ebe oga ekwe mmadụ niile ịghọta nke ọma

READ ALSO:  Brazilian LATAM Pilot Arrested on Plane for Leading Child Exploitation Ring

Ọkụkọ bụ anụ ulo

Akwa bụ ihe na esi na ahu ọkụkọ aputa

Ákwà bụ ihe anyị na eyi na ahụ anyi

Akwá bu ebe idina ala

Ọkwa akwa bụ onye aka olu ya bụ ịkwa akwa

Ugbu a unu matara ya nke ọma, kedu onye ga ekwu ru anyị ya ugboro asaa?

Kpom na akara ±2348138460701 maka i soro ná ụlọ akwụkwọ Igbo anyị na i soro ná ụzọ ndị ọzọ m sina akwado asụsụ Igbo

Share this:
RELATED NEWS
- Advertisment -

Latest NEWS

Trending News

Get Notifications from DDM News Yes please No thanks