26.3 C
Lagos
Saturday, February 14, 2026

[Igbo Corner] Ụbọchị pụrụ iche na Ala Igbo

Share this:

Na ala Igbo, anyị nwere afọ, nkwo, orie na eke. Ụbọchị ọzọ pụrụ iche bụ abalị anọ na onwa iri na otu.

Oké ụbọchị a na abịa naanị otu mgbe na afo. Ihe mere ụbọchị a ji bụrụ akacha nma bụ maka na ọbụ ụbọchị amuru nwa Igbo na enweghị o yiri. Obu ụbọchị amuru onye nzọpụta ndigbo.

Kedụ odogwu a bụ onye nzọpụta Igbo niile? Ọbụ Dim Chukwuemeka Odumegwu Nwa Ojukwu. Ojukwu ụwa niile, Ojukwu Igbo gburugburu. Ojukwu dị ebube Ojukwu okaome, Ojukwu dike.

Ọbụ ezi okwu  na Igbo enweghị eze, ma Chukwuemeka sitere na ezi omume ya bụrụ eze ndigbo

Ojukwu bụrụ ndigbo ihe Moses bụrụ ụmụ Isreal. Ojukwu ji ndụ ya chụọ àjà dịka Jizọs ji ndụ chụọ àjà na kalvary

READ ALSO:  Tragic: Police AIG Abubakar Jinjiri dies in Yola, Adamawa

Ọbụ ihe ọjọọ, ihe ihere na ụmụ Isreal ka na echeta Moses ebe ndigbo chefurule Emeka Ojukwu

Kedụ onye ga adịka ikemba Nnewi? O nweghị mmadụ ga adịka Emeka Ojukwu

Emaka bụ agụ amuru ka mmadụ. Emeka bụ ọzọ Igbo ndụ.

Emeka ji akụ na ụba nna ya luora Igbo ọgụ. Emeka ji ama ihe ya chọọ izu pụta Igbo na aka ekwensu

Igbo bụrụ umu Isreal na ezi okwu, anyị kwesịrị ime ka aha Emeka na ewu ewu na  ụwa niile

Dịka Igbo na asọpụrụ ọjị bụka Igbo kwesịrị isopụrụ Emeka Ojukwu niihi Emeka bụ ọjị Igbo nwoke

READ ALSO:  IPOB Supreme Elders Council disowns N/Delta Avengers, MASSOB

Ndia niile na ekwu okwu biafra kwesịrị ina elere anya na ihe Emeka mèrè ndigbo oge odi ndu

Igbo kwesịrị isopụrụ Emeka Ojukwu dịka ndị Yoruba na akpọ isi ala nye obafemi awolowo

Dịka Igbo ejighị ọfọ na ọgụ egwu egwu bụ ka anyị na ekwesịghị iji Emeka egwu egwu niihi Emeka bụ ọfọ bụkwaara ọgụ ụmụ igbo

Akụkọ Igbo ezughị okè ma ọbụrụ na akpotughi aha Emeka Ojukwu

Emeka Ojukwu mụ bụ iwuoha prince na asị ka mkpụrụ obi gị zuo ike na ala eze

Ọbụrụ na ọnwụ abụghị onye iberibe, o kwesịrị ịma na Emeka Ojukwu adịghị nma ịnwụ anwụ.

READ ALSO:  Man jailed for life for sexually assaulting 4-yr-old in church

Ọbụrụ na ili abụghị onye nzuzu, ili kwesịrị ịma na Emeka Ojukwu adịghị nma ịba na ala ili

Nkasi obi m bụ na ndị nsọ ga ekulite na ọnwụ mgbe opi ike dara, ụbọchị ahụ ka Emeka ụwa niile ga ekulite na ike na ebube

Odi m ka aga asị ka ụbọchị mbilite na ọnwụ bụrụ taa. Ka anyị niile hụ eze anyị Eze CHUKWUEMEKA ODUMEGWU NWA OJUKWU

OJUKWU bu

Okaome na Anambra

Igwe ka ala na Abia

Okaka na Ebonyi

Agụ na eche mba na Imo

Agada gbachiri ụzọ na Enugu

Iwuoha Prince dere ihe a; ±2348138460701.

Share this:
RELATED NEWS
- Advertisment -

Latest NEWS

Trending News

Get Notifications from DDM News Yes please No thanks